46 Ọzọkwa, ọ bịaruru Kena nke Galili bụ ebe ahụ o mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya. E nwekwara otu onye na-arụ ọrụ nʼụlọeze nọ nʼebe ahụ, nke ahụ na-adịghị nwa ya nwoke ike na Kapanọm. 47 Mgbe ọ nụrụ na Jisọs esitela na Judịa bịarute na Galili, o jekwuuru ya rịọ ya ka ọ bịa gwọọ nwa ya, nʼihi na ọ nọ nʼọnụ ọnwụ.
48 Jisọs sịrị ya, "Ọ bụrụ na unu ahụghị ọrụ ebube na ihe ịrịbama, unu agaghị ekwe ma ọlị."
49 Onye a na-arụ ọrụ nʼụlọeze sịrị ya, "Nna m ukwu, biko bịa tupu nwa m a nwụọ."
50 Jisọs sịrị ya, "Laa, nwa gị nwoke ga-adị ndụ."
Nwoke ahụ kweere nʼihe Jisọs kwuru laa. 51 Mgbe ọ ka nọ nʼụzọ, ndị ohu ya zutere ya kọọrọ ya na ahụ adịla nwa ya nwoke mma. 52 Mgbe ọ jụrụ ha oge nwa ya jiri gbakee, ha sịrị ya, "Oke ahụ ọkụ ahụ kwụsịrị ya ụnyaahụ nʼelekere mbụ nke ehihie."
53 Nwoke ahụ ghọtara na ọ bụ kpomkwem nʼoge awa ahụ Jisọs gwara ya, "Nwa gị nwoke ga-adị ndụ." Ya mere ya na ezinaụlọ ya niile kwenyere.
54 Nke a bụ ihe ịrịbama nke abụọ Jisọs rụrụ na Galili mgbe o siri Judịa bịa.