Pular para o conteúdo
Publicidade

João 4

46 Ọzọkwa, bịaruru Kena nke Galili bụ ebe ahụ o mere mmiri ka ghọọ mmanya. E nwekwara otu onye na-arụ ọrụ nʼụlọeze nọ nʼebe ahụ, nke ahụ na-adịghị nwa ya nwoke ike na Kapanọm. 47 Mgbe nụrụ na Jisọs esitela na Judịa bịarute na Galili, o jekwuuru ya rịọ ya ka bịa gwọọ nwa ya, nʼihi na nọ nʼọnụ ọnwụ.

48 Jisọs sịrị ya, "bụrụ na unu ahụghị ọrụ ebube na ihe ịrịbama, unu agaghị ekwe ma ọlị."

49 Onye a na-arụ ọrụ nʼụlọeze sịrị ya, "Nna m ukwu, biko bịa tupu nwa m a nwụọ."

50 Jisọs sịrị ya, "Laa, nwa gị nwoke ga-adị ndụ."

Nwoke ahụ kweere nʼihe Jisọs kwuru laa. 51 Mgbe ka nọ nʼụzọ, ndị ohu ya zutere ya kọọrọ ya na ahụ adịla nwa ya nwoke mma. 52 Mgbe jụrụ ha oge nwa ya jiri gbakee, ha sịrị ya, "Oke ahụ ọkụ ahụ kwụsịrị ya ụnyaahụ nʼelekere mbụ nke ehihie."

53 Nwoke ahụ ghọtara na bụ kpomkwem nʼoge awa ahụ Jisọs gwara ya, "Nwa gị nwoke ga-adị ndụ." Ya mere ya na ezinaụlọ ya niile kwenyere.

54 Nke a bụ ihe ịrịbama nke abụọ Jisọs rụrụ na Galili mgbe o siri Judịa bịa.

Veja também