Pular para o conteúdo
Publicidade

João 6

Jisọs azụọ puku mmadụ ise

1 Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gafere nʼofe nke ọzọ nke osimiri Galili (nke a na-akpọkwa osimiri Tiberịas). 2 Oke igwe mmadụ sooro ya, nʼihi na ha hụrụ ọrụ ebube na-arụ nʼahụ ndị ọrịa. 3 Jisọs rigooro nʼelu ugwu nọdụ ala ya na ndị na-eso ụzọ ya. 4 Nʼoge a, mmemme oriri Ngabiga ndị Juu na-abịa nso.

5 Mgbe Jisọs leliri anya elu hụ oke igwe mmadụ na-abịakwute ya, sịrị Filip, "Olee ebe anyị ga-azụta achịcha ndị a ga-ata?" 6 jụrụ nke a naanị iji nwalee ya, ya onwe ya mararị ihe ga-eme.

7 Filip zara ya, "Ụgwọ ọrụ ọnwa isii agaghị ezu ịzụta achịcha nke onye ọbụla nʼime ha ga-atatụ naanị ihe ntakịrị."

8 Onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya bụ Andru, nwanne Saimọn Pita, kwupụtara, 9 "Otu nwantakịrị nwoke nọ nʼebe a nwere ogbe achịcha balị ise, na azụ abụọ, ma gịnị ka ha bụ nʼetiti igwe mmadụ ha otu a?"

10 Jisọs sịrị, "Meenụ ka ndị mmadụ ndị a nọdụ ala." E nwere ọtụtụ ahịhịa nʼebe ahụ, ụmụ nwoke nọdụrụ ala, ha dị ihe ruru puku mmadụ ise. 11 Ya mere, Jisọs weere achịcha ahụ nye ekele, kee ha ndị niile nọdụrụ ala dị ka ha sịrị chọọ. O jikwa azụ ahụ mee otu ihe ahụ.

12 Mgbe ha niile rijuchara afọ, sịrị ndị na-eso ụzọ ya, "Tụtụkọtanụ iberibe niile fọdụrụ, ka ihe ọbụla hapụ ịla nʼiyi." 13 Ya mere, ha tụtụkọtara ha, kpojuo nkata iri na abụọ, bụ iberibe si nʼogbe achịcha balị ise nke ndị ahụ rifọrọ.

14 Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ ihe ịrịbama ahụ, o mere ha bidoro na-asị, "Nʼeziokwu, onye a bụ onye amụma ahụ nke ga-abịa nʼime ụwa."

Veja também