4 Ha sịrị ya, "Onye ozizi, anyị jidere nwanyị a ka ọ na-akwa iko. 5 Nʼiwu, Mosis nyere anyị ikike ka e jiri okwute tugbuo onye mere ihe dị otu a. Gịnị ka i nwere ikwu banyere nke a?" 6 Ha kwuru nke a iji nwalee ya, iji nweta ihe ha ga-eji ebo ya ebubo.
Ma Jisọs hulatara ala were mkpịsịaka ya dee ihe nʼala. 7 Mgbe ha nọgidere na-ajụ ya ajụjụ, o biliri sị ha, "Onye ọbụla nʼime unu na-emebeghị mmehie ọbụla, ya buru ụzọ tụọ ya nkume." 8 Ọzọ, o hulatakwara ala malite ide ihe ọ na-ede nʼala.
9 Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile nʼotu nʼotu, malite nʼonye okenye ha, sitere nʼebe ahụ pụọ. Nʼikpeazụ, ọ fọdụrụ naanị Jisọs na nwanyị ahụ, ebe o guzoro nʼihu ya. 10 Jisọs guzoro ọtọ jụọ ya sị, "Nwanyị, oleekwanụ ha? Ọ dịghị onye mara gị ikpe?"
11 Ọ sịrị, "O nweghị onye ọbụla Onyenwe anyị."
Jisọs sịrị ya, "Mụ onwe m amakwaghị gị ikpe: Gawa, kama emehiekwala ọzọ."