Publicidade

João 8

4 Ha sịrị ya, "Onye ozizi, anyị jidere nwanyị a ka na-akwa iko. 5 Nʼiwu, Mosis nyere anyị ikike ka e jiri okwute tugbuo onye mere ihe dị otu a. Gịnị ka i nwere ikwu banyere nke a?" 6 Ha kwuru nke a iji nwalee ya, iji nweta ihe ha ga-eji ebo ya ebubo.

Ma Jisọs hulatara ala were mkpịsịaka ya dee ihe nʼala. 7 Mgbe ha nọgidere na-ajụ ya ajụjụ, o biliri sị ha, "Onye ọbụla nʼime unu na-emebeghị mmehie ọbụla, ya buru ụzọ tụọ ya nkume." 8 Ọzọ, o hulatakwara ala malite ide ihe na-ede nʼala.

9 Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile nʼotu nʼotu, malite nʼonye okenye ha, sitere nʼebe ahụ pụọ. Nʼikpeazụ, fọdụrụ naanị Jisọs na nwanyị ahụ, ebe o guzoro nʼihu ya. 10 Jisọs guzoro ọtọ jụọ ya sị, "Nwanyị, oleekwanụ ha? dịghị onye mara gị ikpe?"

11 sịrị, "O nweghị onye ọbụla Onyenwe anyị."

Jisọs sịrị ya, "Mụ onwe m amakwaghị gị ikpe: Gawa, kama emehiekwala ọzọ."

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-