Jisọs agwọọ onye ìsì
1 Mgbe ọ na-agafe, ọ hụrụ otu nwoke kpuru ìsì site nʼafọ nne ya. 2 Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, "Onye ozizi, onye mehiere? Nwoke a ka ọ bụ ndị mụrụ ya, nke mere e ji mụọ ya nʼìsí?"
3 Jisọs sịrị, "Nwoke a emehieghị, ndị mụrụ ya emehiekwaghị, kama o kpuru ìsì ka ọrụ Chineke pụta ìhè na ndụ ya. 4 Anyị aghaghị ịrụ ọrụ onye ahụ zitere m, mgbe chi ka dị, anyasị na-abịa mgbe o nweghị onye pụrụ ịrụ ọrụ. 5 Dị ka m nọ nʼụwa, Abụ m ìhè nke ụwa."
6 Mgbe o kwusiri nke a, ọ bụsara ọnụ mmiri asụ nʼala gwakọta ya na aja, werekwa aja ahụ tee nwoke ahụ nʼanya. 7 Ọ gwara ya, "Gaa nʼọdọ mmiri Sailọm saa ihu gị" (nke a pụtara "Zitere"). Ọ gara saa ihu ya, lọghachita na-ahụ ụzọ.