Pular para o conteúdo
Publicidade

Lucas 1

Ozi banyere ọmụmụ Jisọs

26 Ma nʼọnwa isii ya, Chineke zigara mmụọ ozi ya, bụ Gebrel, ka gaa nʼobodo Nazaret nke dị nʼime Galili. 27 Ka o jekwuru otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke bụ onye otu nwoke aha ya bụ Josef, onye sitere nʼagbụrụ Devid, kwere nkwa ịlụ. Aha nwaagbọghọ a bụ Meri. 28 O jekwuru ya sị ya, "Ekele! Gị onye ihuọma dịkwasịrị. Onyenwe anyị nọnyekwara gị."

29 Ma obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu nʼihi okwu ya. O bidokwara ịtụgharị nʼuche ya ihe ekele a pụtara. 30 Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ya, "Atụla egwu Meri, nʼihi na i chọtala ihuọma nʼebe Chineke nọ. 31 Ma lee ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. ga-akpọkwa aha ya Jisọs. 32 ga-abụ nnukwu mmadụ onye a ga-akpọ Ọkpara Onye kachasị ihe niile elu. Onyenwe anyị Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid. 33 ga-achị ụlọ Jekọb ruo ebighị ebi, alaeze ya agaghị enwekwa ọgwụgwụ."

34 Meri sịrị mmụọ ozi ahụ, "Olee otu nke a ga-esi mee ebe m bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke?"

35 Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, "Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye kachasị ihe niile elu ga-ekpuchikwa gị. Ya mere onye nsọ ahụ a ga-amụ, a ga-akpọ ya Ọkpara Chineke. 36 Lekwa Elizabet onye ikwu gị atụrụla ime nwa nwoke nʼagadi ya. Nke a bụ ọnwa isii ya, bụ onye ahụ ha na-akpọ nwanyị aga. 37 Nʼihi na dịghị okwu sitere na Chineke nke na-agaghị ere."

38 Meri zaghachiri sị, "Abụ m ohu Onyenwe anyị, ka dịrị m dị ka i kwuru." Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya laa.

Veja também