Pular para o conteúdo
Publicidade

Lucas 1

Abụ Meri bụrụ

46 Ma Meri sịrị,

"Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu

47 mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m,

48 nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m,

bụ odibo ya dị ala.

Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi.

49 Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu.

Aha ya dịkwa nsọ.

50 Ebere ya na-erute ndị niile na-atụ egwu ya

site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

51 O gosila ike aka ya;

chụsasịala ndị dị mpako nʼime echiche obi ha.

52 O sitela nʼocheeze ndị eze dị ike kwatuo ha,

buliekwa ndị dị umeala nʼobi elu.

53 O jirila ihe dị mma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ

ma ndị ọgaranya ka o zipụrụ nʼaka efu.

54 O nyerela odibo ya bụ Izrel aka,

na-echetakwa imere ya ebere.

55 Dị ka gwara nna nna anyị ha,

nye Ebraham na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi."

Veja também