Abụ Meri bụrụ
46 Ma Meri sịrị,
"Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu
47 mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m,
48 nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m,
bụ odibo ya dị ala.
Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi.
49 Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu.
Aha ya dịkwa nsọ.
50 Ebere ya na-erute ndị niile na-atụ egwu ya
site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
51 O gosila ike aka ya;
ọ chụsasịala ndị dị mpako nʼime echiche obi ha.
52 O sitela nʼocheeze ndị eze dị ike kwatuo ha,
buliekwa ndị dị umeala nʼobi elu.
53 O jirila ihe dị mma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ
ma ndị ọgaranya ka o zipụrụ nʼaka efu.
54 O nyerela odibo ya bụ Izrel aka,
ọ na-echetakwa imere ya ebere.
55 Dị ka ọ gwara nna nna anyị ha,
nye Ebraham na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi."