Pular para o conteúdo
Publicidade

Lucas 10

30 Jisọs sịrị ya, "Otu nwoke sitere Jerusalem na-aga Jeriko, dabara nʼaka ndị ohi, ndị gbara ya ọtọ, tiekwa ya ihe, hapụ ya nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma laa. 31 Ma dị ka ihe si eme, otu onye nchụaja sitere ụzọ ahụ na-agafe. Mgbe hụrụ ya, o sitere nʼakụkụ ụzọ nke ọzọ gafee. 32 Otu a kwa, otu onye Livayị bịarutekwara nʼebe ahụ, hụ ya, ma o sitere nʼakụkụ ụzọ nke ọzọ gafeekwa. 33 Ma otu onye Sameria na-aga njem, mgbe bịarutere nso nʼebe ahụ; hụ ya, o nwere ọmịiko nʼahụ ya. 34 gara nso nʼebe nọ, jiri mmanya na mmanụ wụsa nʼọnya ya, were akwa kechie ya. tụkwasịrị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buba ya nʼụlọ ndị ije ebe o lekọtara ya anya nke ọma. 35 Nʼechi ya, o wepụtara mkpụrụ ego ọlaọcha abụọ nye onye na-elekọta ụlọ ndị ije ahụ sị ya, Lezie ya anya nke ọma. M lọta aga m akwụghachi gị ihe ọbụla ọzọ i mefuru.

36 "Onye nʼime mmadụ atọ ndị a ka i chere bụ onye gosiri onwe ya dị ka onye agbataobi nye nwoke ahụ nke dabara nʼaka ndị ohi?"

37 sịrị, "bụ onye ahụ meere ya ebere."

Jisọs sịrị ya, "Laa, gaa mee otu ahụ."

Veja também