Pular para o conteúdo
Publicidade

Lucas 12

15 Ma sịrị ha, "Kpachapụnụ anya! Nọrọnụ na nche banyere oke ọchịchọ niile, nʼihi na ndụ mmadụ adabereghị nʼọtụtụ ihe o nwere."

16 tụụrụ ha ilu a sị, "Otu ọgaranya nwere ala mịrị nnọọ mkpụrụ dị ukwuu. 17 O chere nʼime onwe ya sị, Gịnị ka m ga-eme nʼihi na enweghị m ebe m ga-echekwa mkpụrụ m?

18 "Ya mere sịrị, Ihe m ga-eme bụ nke a, aga m akwatu ọba m, wuo nke ka ya ukwuu, bụ ebe m ga-echekwa mkpụrụ m na ihe ndị ọzọ. 19 Ya mere aga m agwa mkpụrụobi m, "I nwere ọtụtụ ezi ihe ga-ezuru gị ọtụtụ afọ, nʼihi ya zuru ike, rie, ṅụọ ma nweekwa obi ụtọ." 

20 "Ma Chineke gwara ya sị, Onye nzuzu, nʼabalị a ka a ga-achọ mkpụrụobi gị nʼaka gị. Ihe niile kpakọtara nke onye ka ha ga-abụ?

21 "Otu a ka ga-adịrị onye ọbụla na-akpadoro naanị onwe ya akụ, ma baghị ụba nʼebe Chineke nọ."

Veja também