Pular para o conteúdo
Publicidade

Luk 15:1-7

Ilu maka atụrụ furu efu

1 Ugbu a, ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-abịa ya nso ịnụta ihe ọ na-ekwu. 2 Ndị Farisii na ndị ozizi iwu tamuru ntamu na-asị, "Nwoke a na-anabata ndị mmehie sorokwa ha na-eri nri."

3 Ya mere, ọ tụrụ ha ilu a sị, 4 "Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu enwee narị atụrụ ma otu nʼime ha akpafuo. Ọ bụ na ọ gaghị ahapụ iri atụrụ itoolu na itoolu ahụ fọdụrụ nʼọzara, pụọ ịchọgharị otu ahụ kpafuru ruo mgbe ọ chọtara ya? 5 Mgbe ọ chọtara ya, ọ ga-eji ọṅụ tụkwasị ya nʼubu ya. 6 Mgbe ọ lọtara nʼụlọ ya, ọ ga-akpọkọta ndị enyi ya na ndị agbataobi ya sị ha, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ nʼihi na achọtala m atụrụ m furu efu.’ 7 Asị m unu, nʼụzọ dị otu a, ọṅụ dị ukwu ga-adị nʼeluigwe nʼihi otu onye mmehie nke chegharịrị, karịa iri itoolu na itoolu ndị ezi omume bụ ndị nchegharị na-adịghị mkpa.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.