12 Mgbe ọ banyere nʼotu obodo nta, ndị ekpenta iri sitere nʼebe dị anya zute ya. 13 Ha tiri mkpu nʼoke olu sị, "Jisọs nna anyị ukwuu, mere anyị ebere."
14 Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha, "Gaanụ gosi ndị nchụaja onwe unu." Dị ka ha na-aga, e mere ka ha dị ọcha.
15 Mgbe otu nʼime ha chọpụtara na a gwọọla ya, ọ laghachiri azụ, jiri oke olu na-eto Chineke. 16 Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, kelee ya. Ọ bụ onye Sameria.
17 Jisọs jụrụ sị, "Ọ bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha, ebeekwanụ ka itoolu ndị ọzọ nọ? 18 Ọ bu naanị onye mba ọzọ a lọghachiri inye Chineke otuto?" 19 Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, "Bilie, laa, okwukwe gị agwọọla gị."