Zakịọs ezute Jisọs
1 Ọ banyere Jeriko mgbe ọ na-agafe. 2 Otu nwoke nọ ebe ahụ, aha ya bụ Zakịọs; ọ bụ onyeisi ndị ọna ụtụ bụrụkwa ọgaranya. 3 Ọ chọrọ ịhụ onye Jisọs bụ ma ebe ọ bụ onye mkpụmkpụ, ọ dịrịghị ya mfe nʼihi igwe mmadụ. 4 Ya mere, ọ gbaara ọsọ gaa nʼihu rigoro nʼotu osisi sikamọ, ka o nwee ike ịhụ ya dị ka ọ na-agafe nʼụzọ ahụ.
5 Mgbe Jisọs rutere nʼebe ahụ, o lere anya nʼelu sị ya, "Zakịọs, rịdata ngwangwa. Aga m abụ ọbịa nʼụlọ gị taa." 6 Ọ rịdatara nʼotu mgbe ahụ jirikwa obi ụtọ nabata ya.
7 Mmadụ niile hụrụ nke a, ma bido na-atamu sị, "Ọ gaala ịbụ ọbịa onye mmehie."
8 Ma Zakịọs biliri ọtọ gwa Onyenwe anyị, "Lee, Onyenwe anyị, aga m enye ndị ogbenye ọkara ihe niile m nwere. Ọ bụrụkwa na o nwere onye m ghọgburu nara ya ihe ọbụla, aga m akwụghachi ya okpukpu anọ."
9 Jisọs gwara ya, "Taa nzọpụta abịala nʼụlọ a, nʼihi na onye a bụkwa nwa Ebraham. 10 Nʼihi na Nwa nke Mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ndị furu efu."