Pular para o conteúdo
Publicidade

Lucas 2

Ọmụmụ Jisọs

1 Nʼoge ahụ, Siza Ọgọstọs nyere iwu ka a gụọ ọnụ, detuo aha mmadụ niile bi nʼụwa dum.2:1 Ụwa dum na-ekwu maka Rom mgbe ochie maọbụ mba niile ndị Rom na-achị. 2 (Nke a bụ ịgụ ọnụ na ide aha nke mbụ e mere mgbe Kwirinus bụ onye na-achị Siria.) 3 Onye ọbụla gara nʼobodo ya, ka e denye aha ya nʼakwụkwọ.

4 Ya mere Josef hapụrụ Nazaret nke dị na Galili, gaa Betlehem nke dị na Judịa, nke bụkwa obodo Devid, nʼihi na o si nʼụlọ na agbụrụ Devid pụta. 5 Ya na Meri, nwaagbọghọ o kwere nkwa ịlụ, nke dịkwa ime, soro gaa ka o denye aha ha.

Veja também