25 Ma lee, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem aha ya bụ Simiọn, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ bụ onye ezi omume bụrụkwa onye ji obi ya niile na-efe Chineke. Ọ bụkwa onye na-ele anya maka nkasiobi nke ndị Izrel. 26 Ma Mmụọ Nsọ Chineke mere ka ọ mata na ọ gaghị anwụ ruo mgbe ọ hụrụ Kraịst nke Onyenwe anyị. 27 Site nʼodudu nke Mmụọ Nsọ, ọ batara nʼụlọnsọ ukwu, ma mgbe nne na nna nwata ahụ bụ Jisọs kubatara ya dị ka omenaala iwu si dị, 28 Simiọn kuuru ya nʼaka, kelee Chineke sị,
29 "Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe dị ka i kwere na nkwa,
ugbu a zilaga nwaodibo gị nʼudo.
30 Nʼihi na anya m ahụla nzọpụta gị,
31 nke i kwadoro nʼihu mba niile.
32 Ìhè nke ga-egosi ndị mba ọzọ ụzọ,
na ebube nke ndị gị Izrel."