Ndị ọzụzụ atụrụ na ndị Mmụọ Ozi
8 Ma e nwere ndị ọzụzụ atụrụ2:8 Ndị ọzụzụ atụrụ Maọbụ, ndị na-elekọta atụrụ. bi nʼọhịa nʼakụkụ ebe ahụ, ndị na-eche igwe atụrụ ha nche nʼabalị. 9 Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị pụtara ihe nye ha. Ebube Onyenwe anyị mụwara gburugburu ha, oke egwu tụrụ ha. 10 Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ha, "Unu atụla egwu. Ana m ewetara unu oziọma nke oke ọṅụ nke ga-adịrị mmadụ niile. 11 Nʼihi na taa, nʼobodo Devid ka a mụrụ Onye nzọpụta nye unu; ọ bụ Kraịst, Onyenwe anyị.