Pular para o conteúdo
Publicidade

Luk 23:39-43

39 Otu onye nʼime ndị ohi ahụ a kpọgidekwara nʼobe nʼebe ahụ kparịkwara ya sị, "Ọ bụghị gị bụ Kraịst? Zọpụtanụ onwe gị ma zọpụtakwa anyị."

40 Ma onye nke ọzọ a makwara ikpe ọnwụ baara ya mba sị, "Ị naghị atụ Chineke egwu, ị hụghị na a mara gị ikpe dị ka e si maa ya. 41 Anyị na-ata ahụhụ kwesiri anyị, nʼihi na a na-ata anyị ahụhụ nʼihi ihe anyị mere, ma nwoke a emeghị ihe ọjọọ ọbụla."

42 Mgbe ahụ ọ sịrị, "Jisọs, chetakwa m mgbe ị bara nʼalaeze gị."

43 Ọ sịrị ya, "Nʼezie a agwa m gị, taa, ị ga-anọnyere m na paradaịs."

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.