18 Nʼoge ahụ ndị ikom ụfọdụ bu otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼihe ndina ya, bịara gbalịa isite nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ bubata ya tọgbọ ya nʼụkwụ ya. 19 Mgbe ha na-enweghị ike ime nke a nʼihi igwe mmadụ, ha rigooro nʼelu ụlọ, site nʼoghere wetuo nwoke ahụ nʼute ya nʼetiti igwe mmadụ nʼihu Jisọs.
20 Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị, "Enyi m, a gbagharala gị mmehie gị."
21 Ndị Farisii na ndị ozizi iwu malitere iche nʼime obi ha sị, "Onye bụ onye a na-ekwulu Chineke? Onye pụrụ ịgbaghara mmadụ mmehie, ma ọ bụghị naanị Chineke?"
22 Mgbe Jisọs matara ihe ha na-ajụ, ọ zara ha sị, "Gịnị mere unu ji na-eche ihe ndị a nʼobi unu? 23 Olee nke ka mfe ikwu: Ọ bụ a gbagharala gị mmehie gị niile, ka ọ bụ ị sị, Bilie jee ije? 24 Ma ka unu mata na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie." Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, "Asị m gị, bilie, chịrị ute gị laa nʼụlọ gị!" 25 Ngwangwa, o biliri ọtọ nʼihu mmadụ niile, chịrị ihe ndina ya bido na-eto Chineke na-ala nʼụlọ ya.