Pular para o conteúdo
Publicidade

Lucas 6

6 Nʼụbọchị izuike ọzọ, banyere nʼụlọ ekpere na-ezi ihe. Otu nwoke nọkwa nʼebe ahụ onye aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ. 7 Ndị Farisii na ndị ode akwụkwọ na-achọ ụzọ ha ga-esi boo ya ebubo, ya mere ha lekwasịrị ya anya ịhụ ma ga-agwọ ọrịa nʼụbọchị izuike. 8 Ma ebe maara ihe ha na-ezube nʼobi ha, kpọrọ nwoke ahụ nke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị ya, "Bilie bịa guzoro nʼetiti ebe a." Nwoke ahụ pụtara bịa guzoro ebe ahụ.

9 Mgbe ahụ Jisọs sịrị ha, "Ka m jụọ unu, gịnị ziri ezi nʼiwu ime nʼụbọchị izuike; bụ ime ihe ọma ka bụ ime ihe ọjọọ; ịzọpụta ndụ ka bụ ịla ndụ nʼiyi?"

10 Mgbe o lesiri ha niile anya gburugburu, sịrị ya, "Setịpụ aka gị." O mere nke a, aka ya dịkwara mma ọzọ.

Veja também