Pular para o conteúdo
Publicidade

Lucas 7

Okwukwe onye ọchịagha

1 Mgbe o kwusiri okwu ndị a nye ndị na-ege ya ntị, banyere na Kapanọm. 2 Ma e nwere otu ọchịagha7:2 Ọ bụ onye Rom. nke nwere otu ohu nwoke hụrụ nʼanya. Onye nọ nʼọrịa na nʼọnụ ọnwụ. 3 Mgbe nụrụ ihe banyere Jisọs, o zipụrụ ụfọdụ ndị okenye ndị Juu ka ha gaa rịọrọ ya ka bịa gwọọ ohu ya. 4 Mgbe ha bịakwutere Jisọs, ha rịọsiri ya arịrịọ ike sị, "O kwesiri ka i mere ya ihe a. 5 Nʼihi na hụrụ obodo anyị nʼanya. O wukwaara anyị ụlọ ekpere." 6 Jisọs sooro ha gawa.

Ma mgbe nọ nso nʼụlọ ya, onye ọchịagha ahụ zipụrụ ndị enyi ya ka ha ga sị ya, "Onyenwe anyị, esogbukwala onwe gị, nʼihi na etorughị m ka bata nʼokpuru ụlọ m. 7 bụ ya mere na-echeghị m na m toruru ịpụta bịa zute gị. Ma kwuo okwu, ga-agwọkwa odibo m. 8 Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a gaa,gaa, sịkwa onye nke ọzọ bịa,bịa. Ana m asị ohu m, mee nke a,na-emekwa ya."

9 Mgbe Jisọs nụrụ okwu niile a, o juru ya anya nke ukwuu. tụgharịrị gwa igwe mmadụ ndị na-eso ya sị, "Asị m unu, ahụbeghị m okwukwe dị otu a bụladị nʼIzrel." 10 Mgbe ndị ozi ahụ laghachiri nʼụlọ, ha chọpụtara na ahụ adịla ohu ahụ mma.

Veja também