Pular para o conteúdo
Publicidade

Lucas 7

24 Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn pụrụ, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ ahụ okwu banyere Jọn sị, "Gịnị ka unu gara nʼọzara ịhụ? bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị? 25 Ma gịnị ka unu pụrụ ịga ịhụ? bụ nwoke yi uwe mara mma? E e, ndị na-eyi uwe dị oke ọnụahịa, ndị na-ebikwa nʼoke oriri na oke ọṅụṅụ bi nʼụlọeze. 26 Ma gịnị ka unu pụrụ ka unu ga-ahụ? bụ onye amụma? E, ana m a gwa unu, unu hụrụ onye karịrị onye amụma. 27 bụ onye a bụ onye ahụ e dere ihe banyere ya sị,

" Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị,

onye ga-edozi ụzọ gị nʼihu gị. 7:27 Mal 3:1

28 Agwa m unu, nʼetiti ndị nwanyị mụrụ, dịghị onye dị ukwuu karịa Jọn, ma onye dịkarịsịrị nta nʼalaeze Chineke dị ukwuu karịa ya."

29 (Ndị mmadụ niile nụrụ nke a, tinyekwara ndị ọna ụtụ, nabatara nʼụzọ Chineke bụ nke ziri ezi, nʼihi na Jọn emela ha baptizim. 30 Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ imezu ebumnobi Chineke nye ha onwe ha, nʼihi na ha anabataghị ka Jọn mee ha baptizim.)

Veja também