Pular para o conteúdo
Publicidade

Lucas 8

49 Mgbe ka nọ na-ekwu okwu, otu onye si nʼụlọ Jairọs bụ onyeisi ụlọ ekpere, bịara sị, "Ada gị nwanyị anwụọla, enyekwala onye ozizi nsogbu ọzọ."

50 Ma mgbe Jisọs nụrụ ozi a, zara ya sị, "Atụla egwu, naanị kwere, a ga-agwọkwa ya."

51 Mgbe o rutere nʼụlọ Jairọs, o kweghị ka onye ọbụla soro ya baa nʼime ụlọ ahụ ma bụghị naanị Pita, Jọn, Jemis, nne na nna nwata ahụ. 52 Nʼoge ahụ, ha niile nọ na-ebe akwa na-eru ụjụ maka nwata ahụ. sịrị ha, "Unu ebezila akwa, nʼihi na nwụghị anwụ kama nọ nʼụra."

53 Ha chịrị ya ọchị, nʼihi na ha matara na nwụrụ anwụ. 54 Ma o jidere ya nʼaka, sị, "Nwa m, bilie!" 55 Mmụọ ya lọghachiri, o bilitekwara mgbe ahụ. gwakwara ha ka ha chọọrọ ya nri ka o rie. 56 Ihe a gbara ndị mụrụ ya gharịị ma nyere ha iwu ka ha ghara ịkọrọ onye ọbụla ihe mere.

Veja também