49 Mgbe ọ ka nọ na-ekwu okwu, otu onye si nʼụlọ Jairọs bụ onyeisi ụlọ ekpere, bịara sị, "Ada gị nwanyị anwụọla, enyekwala onye ozizi nsogbu ọzọ."
50 Ma mgbe Jisọs nụrụ ozi a, ọ zara ya sị, "Atụla egwu, naanị kwere, a ga-agwọkwa ya."
51 Mgbe o rutere nʼụlọ Jairọs, o kweghị ka onye ọbụla soro ya baa nʼime ụlọ ahụ ma ọ bụghị naanị Pita, Jọn, Jemis, nne na nna nwata ahụ. 52 Nʼoge ahụ, ha niile nọ na-ebe akwa na-eru ụjụ maka nwata ahụ. Ọ sịrị ha, "Unu ebezila akwa, nʼihi na ọ nwụghị anwụ kama ọ nọ nʼụra."
53 Ha chịrị ya ọchị, nʼihi na ha matara na ọ nwụrụ anwụ. 54 Ma o jidere ya nʼaka, sị, "Nwa m, bilie!" 55 Mmụọ ya lọghachiri, o bilitekwara mgbe ahụ. Ọ gwakwara ha ka ha chọọrọ ya nri ka o rie. 56 Ihe a gbara ndị mụrụ ya gharịị ma ọ nyere ha iwu ka ha ghara ịkọrọ onye ọbụla ihe mere.