Ihe ọ ga-efu iso Jisọs
57 Mgbe ha nọ na-aga ije a, otu nwoke sịrị ya, "Aga m eso gị gaa ebe ọbụla ị na-aga."
58 Jisọs zara, sị, "Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina, ụmụ nnụnụ nke igwe nwekwara akwụ, ma Nwa nke Mmadụ enweghị ebe ọ na-atụkwasị isi."
59 Ọ gwara onye ọzọ sị, "Soro m."
Ma ọ sịrị ya. Onyenwe anyị, "Biko, nye m ohere ka m gaa buru ụzọ lie nna m."
60 Ma ọ sịrị ya, "Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha. Ma gị gaa kwusaa alaeze nke Chineke."
61 Ma onye ọzọkwa, sịrị ya, "Aga m eso gị, Onyenwe m, ma kwere ka m buru ụzọ gaa sị ndị ezinaụlọ m nọdụnụ nke ọma."
62 Jisọs sịrị ya, "Onye ọbụla jidere aka nʼọgụ anụ ụlọ na-adọkpụ ma na-ele anya nʼazụ ekwesighị alaeze Chineke."