Arịrịọ Jemis na Jọn
35 Jemis na Jọn ụmụ Zebedi bịakwutere ya. Ha sịrị ya, "Onye ozizi, anyị chọrọ ka i meere anyị ihe ọbụla anyị rịọrọ."
36 Ọ sịrị ha, "Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?"
37 Ha sịrị ya, "Kwere ka otu onye nʼime anyị nọrọ nʼaka nri gị, onye nke ọzọ nʼaka ekpe gị nʼime ebube gị."