6 Ma na mmalite nke okike ụwa, Chineke ‘kere ha nwoke na nwanyị.’10:6 Jen 1:27 7 ‘Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. 8 Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.’10:8 Jen 2:24 Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. 9 Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya."
Publicidade