Pular para o conteúdo
Publicidade

Marcos 2

3 Ndị ikom ụfọdụ buteere ya otu nwoke ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. bụ mmadụ anọ bu ya. 4 Ebe ha na-enweghị ike ibutere ya Jisọs nʼihi igwe mmadụ, ha gwupuru oghere nʼelu ụlọ ebe ahụ nọ. Mgbe ha gwupusiri ya, ha budatara onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼute o jiri dina. 5 Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, sịrị onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, "Nwa m nwoke, agbagharala gị mmehie gị."

6 Ma ụfọdụ ndị ozizi iwu nọdụrụ ala nʼebe ahụ na-eche nʼime obi ha sị, 7 "Gịnị mere onye a ji na-ekwulu Chineke? Onye pụrụ ịgbaghara mmehie ma bụghị naanị Chineke?"

8 Ngwangwa Jisọs matara nʼime mmụọ ya na ha na-atule okwu a nʼime obi ha. sịrị ha, "Gịnị mere unu ji na-eche ihe dị otu a nʼobi unu? 9 Olee nke ka mfe: bụ ịgwa onye a akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, A gbagharala gị mmehie gị niile,ka bụ i sị, Bilie chịrị ute gị jegharịa? 10 Ma igosi unu na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie." sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, 11 "Ana m asị gị, bilie, chịrị ute gị laa nʼụlọ gị." 12 O biliri, chịrị ute ya pụọ nʼihu mmadụ niile. Nke a juru ndị niile nọ nʼebe ahụ anya. Ha toro Chineke na-asị, "Anyị ahụbeghị ihe dị otu a mbụ!"

Veja também