Pular para o conteúdo
Publicidade

Marcos 3

22 Ma ndị ozizi iwu si Jerusalem bịa sịrị, "Mmụọ Belzebub bi nʼime ya! bụkwa nʼike onyeisi ndị mmụọ ọjọọ ka o ji achụpụ mmụọ ọjọọ."

23 Ma kpọrọ ha jiri ilu gwa ha okwu sị, "Ekwensu pụrụ ịchụpụ ekwensu? 24 bụrụ na alaeze ekewa megide onwe ya alaeze ahụ apụghị iguzo. 25 bụrụ na ezinaụlọ ekewa megide onwe ya, ezinaụlọ ahụ apụghị iguzo. 26 bụrụkwa na ekwensu ebilie megide onwe ya si otu a nwee nkewa, o nweghị ike iguzo; kama ọgwụgwụ oge ya abịala nso. 27 Nʼezie, dịghị onye nwere ike ịbanye nʼụlọ nwoke dị ike kwakọrọ ngwongwo ya niile, ma o bughị ụzọ kee nwoke ahụ siri ike agbụ. Mgbe ahụ ga-enwe ike ịbanye nʼụlọ ya, zukọrọ ngwongwo ya niile. 28 Nʼezie agwa m unu, na a ga-agbaghara ụmụ mmadụ mmehie na nkwulu niile nke ha kwuru. 29 Ma onye ọbụla ga-ekwulu Mmụọ Nsọ, enweghị ike ịgbaghara ya. bụ onye ikpe mmehie ebighị ebi mara."

30 O kwuru nke a nʼihi na ha na-asị, "Mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya."

Veja também