Pular para o conteúdo
Publicidade

Marcos 3

Nne na ụmụnne Jisọs

31 Mgbe ahụ, nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke bịara, guzoro nʼezi. Ha ziri ozi ka a kpọọ ya. 32 Igwe mmadụ gbara ya gburugburu mgbe ahụ gwara ya sị, "Lee, nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke na ndị nwanyị guzo nʼezi. Ha chọrọ ịhụ gị."

33 zara sị, "Onye bụ nne m, ndị ole bụkwa ụmụnne m ndị nwoke?"

34 Mgbe ahụ, o lere ndị nọ ya gburugburu anya ma sị, "Ndị a bụ nne m, na ụmụnne m ndị nwoke! 35 Onye ọbụla na-eme uche Chineke bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, na nne m."

Veja também