Pular para o conteúdo
Publicidade

Marcos 5

25 Ma otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ. 26 taala ahụhụ dị ukwuu nʼaka ndị dibịa, mefukwaa ihe niile o nwere. Ma kama ọrịa ya ịdị mma, na-aga nʼihu ịdị njọ. 27 Ebe nụrụla akụkọ banyere Jisọs, o sooro igwe mmadụ ndị ahụ, sitere nʼazụ metụ uwe ya aka. 28 Nʼihi na o kwuolarị nʼime obi ya sị, "bụrụ nnọọ na m enwe ike metụ naanị uwe ya aka, a ga-agwọkwa m." 29 Ngwangwa oruru ọbara ya kwụsịrị. matakwara nʼime onwe ya na ya enwerela onwe ya site nʼọrịa ya.

30 Nʼotu oge ahụ Jisọs matara na ike esitela ya nʼahụ pụọ. tụgharịrị gburugburu nʼetiti igwe mmadụ ahụ jụọ sị, "Onye metụrụ uwe m aka?"

31 Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, "Lee ọtụtụ igwe mmadụ gbara gị gburugburu, i sikwa aṅaa na-ajụ, Onye metụrụ uwe m aka?"

32 Ma Jisọs gara nʼihu na-ele anya gburugburu ịhụ onye mere ya. 33 Ma nwanyị ahụ, ebe matara ihe mere nʼahụ ya, bịara nʼegwu nʼịma jijiji daa nʼụkwụ ya, gwa ya eziokwu niile. 34 sịrị ya, "Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo nwerekwa onwe gị site nʼọrịa gị."

Veja também