10 Nʼihi na Mosis sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,’7:10 Ọpụ 20:12; Dit 5:16 na, ‘onye ọbụla kwujọrọ nne maọbụ nna ya ka e gbuo ya.’7:10 Ọpụ 21:17; Lev 20:9 11 Ma unu na-asị, na ọ bụrụ na mmadụ asị nne ya maọbụ nna ya, ‘Ihe ọbụla bụ nke ị gara erite nʼaka m bụ kọban,’ (nke pụtara onyinye dịrị Chineke).7:11 Nke a adịghị nʼiwu Chineke nyere. 12 Nʼụzọ dị otu a, unu na-akwagide ndị mmadụ ka ha hapụ inyere nne na nna ha aka. 13 Nʼụzọ dị otu a, unu na-eme okwu Chineke ka ọ bụrụ ihe efu, site nʼomenaala unu nke unu nyefere nʼaka ndị ọzọ. Ọ dịkwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị ka nke a unu na-eme."
Publicidade