Pular para o conteúdo
Publicidade

Marcos 7

Ọgwụgwọ onye ntị chiri na onye ogbu

31 Emesịa, hapụrụ akụkụ Taịa gabiga Saịdọn bịaruo nʼosimiri Galili ruo nʼobodo ndị dị na Dekapọlịs. 32 Ha duteere ya otu nwoke ntị chịrị, nke na-asụkwa oke nsụ. Ha rịọrọ ya ka o bikwasị ya aka.

33 O duuru ya pụọ nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, rụnye ya mkpịsịaka nʼime ntị ya abụọ. Mgbe ahụ gbụpụkwara ọnụ mmiri metụkwa ya aka nʼire. 34 O leliri anya nʼeluigwe sụọ ude sị ya, "Ef fata," nke pụtara "Meghee!" 35 Ngwangwa, ntị ya meghere, a tọpụkwara ire ya, malite ikwu okwu nke ọma.

36 Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịgwa onye ọbụla, ma mgbe na-eme nke a ha gara nʼihu na-akọsa ya ebe niile. 37 tụrụ ha nʼanya nke ukwuu, ha kwuo sị, "O meela ihe niile nke ọma. na-eme ka bụladị ndị ntị chiri nụ ihe, ma mee ka ndị ogbi kwuo okwu."

Veja também