Jisọs agwọọ onye ìsì na Betsaida
22 Mgbe ha ruru Betsaida, ụfọdụ mmadụ kpọtaara ya otu onye ìsì rịọọ ya ka o metụ ya aka, 23 Ọ duuru onye ìsì ahụ nʼaka pụọ nʼazụ obodo. Mgbe ahụ, ọ gbụsara ọnụ mmiri nʼanya ya metụkwa ya aka nʼanya. Ọ jụrụ ya sị, "Ị na-ahụ ihe ọbụla?"
24 Nwoke ahụ leliri anya elu ma sị, "Ana m ahụ ndị mmadụ ma ha dị ka osisi na-agagharị agagharị."
25 Nke ugboro abụọ Jisọs metụkwara ya aka nʼanya, mgbe ahụ anya ya meghere. O bidoro ịhụ ihe niile nke ọma. 26 Ọ zilagara ya ụlọ ya sị ya, "Abanyekwala nʼime obodo."