17 Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ zara ya sị, "Onye ozizi akpọtaara m gị nwa m nwoke, nke mmụọ ọjọọ bi nʼime ya, nke mekwara ka ọ daa ogbi.
22 Ọ na-eme ya ka ọ daba nʼọkụ, maọbụ na mmiri, ka ọ laa ya nʼiyi. Ọ bụrụ na ọ dị ihe i nwere ike ime, biko meere anyị ebere, nyere anyị aka."
23 Jisọs sịrị ya, " ‘Ọ bụrụ na i nwere ike’? Ihe niile pụrụ ime nʼebe onye kwere ekwe nọ."
24 Ngwangwa, nna nwata ahụ tiri mkpu sị, "Ekweere m, biko nyere ekweghị ekwe m aka!"