15 Ọ bụ na ọ bụghị otu Chineke ahụ kere gị? Nʼanụ ahụ na nʼime mmụọ, unu bụ nke ya. Ma gịnị ka otu Chineke a chọrọ? Ka unu bụrụ ụmụ na-atụ ya egwu. Ya mere, jie mmụọ gị aka, ka ị gharakwa ịbụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe nwunye ị lụtara nʼokorobịa nọ.
16 "Akpọrọ m ịgba alụkwaghị m asị," ka Onyenwe anyị Chineke nke Izrel sịrị, "a kpọkwara nwoke na-emeso nwunye ya mmeso nʼụzọ ihe ike asị." Ọ bụ Onyenwe Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
Ya mere, kpachapụrụnụ onwe unu anya, unu abụkwala ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi.