Nne Jisọs na ụmụnne ya
46 Mgbe ọ nọ na-agwa igwe mmadụ ahụ okwu, nne ya na ụmụnne ya bịara guzoro nʼezi na-eche ka ha gwa ya okwu. 47 Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ gwara ya okwu sị, "Lee, nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke na-achọ ịhụ gị nʼezi. Ha chọrọ ịgwa gị okwu."
48 Ma ọ zara onye ahụ gwara ya okwu sị, "Onye bụ nne m? Olee ndị bụ ụmụnne m ndị nwoke?" 49 Ọ tụrụ ndị na-eso ụzọ ya aka, sị, "Lee, ndị a bụ nne m na ụmụnne m ndị nwoke. 50 Nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe Nna m bi nʼeluigwe chọrọ, bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, nakwa nne m."