Pular para o conteúdo
Publicidade

Mateus 13

3 O ji ilu gwa ha ọtụtụ ihe. gwara ha sị, "O nwere otu onye ọrụ ubi gara ịkụ mkpụrụ nʼubi ya. 4 Mgbe na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nʼime ha dara nʼakụkụ ụzọ ebe ụmụ nnụnụ bịara tụrịa ha loo. 5 Ma ụfọdụ nʼime ha dara nʼala dị nkume nkume. dịghị anya ha puputara, too, nʼihi na aja dị nʼebe ahụ emighị emi. 6 Ma mgbe anwụ mụkwasịrị ha, ha chanwụrụ, kpọnwụọ, nʼihi na mgbọrọgwụ ha emikpughị emikpu nʼime ala. 7 Mkpụrụ ụfọdụ danyere nʼetiti ogwu, ogwu ahụ topụtara kpagbuo ha. 8 Ma ụfọdụ mkpụrụ dara nʼezi ala, mịakwa ọtụtụ mkpụrụ. Ụfọdụ mịrị mkpụrụ iri atọ, ụfọdụ iri isii, ụfọdụ kwa otu narị. 9 Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ."

Veja também