Pular para o conteúdo
Publicidade

Mateus 14

Jisọs enye puku mmadụ ise nri

13 Mgbe Jisọs nụrụ akụkọ a, banyere nʼụgbọ mmiri gaa nʼọzara, ebe ga-anọdụrụ onwe ya. Ma mgbe igwe mmadụ nụrụ ya, ha si obodo dị iche iche sooro ya nʼukwu ala. 14 Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri ahụ rịdata, hụrụ oke igwe mmadụ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, gwọọ ndị ọrịa nʼetiti ha.

15 Nʼoge anyasị ụbọchị ahụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, "Chi na-achọ iji. Ebe a abụkwaghị ebe ndị mmadụ bi. O nweghị nri a ga-azụta nʼọzara a. Zilaga igwe mmadụ ndị a ka ha gaa nʼime obodo zụọra onwe ha nri."

16 Ma Jisọs gwara ha sị, "dịghị mkpa na ha ga-ala. Nyenụ ha nri ka ha rie."

17 Ha zara ya sị, "bụ naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ ka anyị nwere."

18 sịrị ha, "Wetaranụ m ha nʼebe a." 19 gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼahịhịa. O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ahụ welie anya ya elu nye Chineke ekele. nyawara achịcha ahụ, nye ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya nyere ha igwe mmadụ ahụ. 20 Onye ọbụla riri rijuo afọ. Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jisọs tụtụkọtara iberibe achịcha dara nʼala tụtụjuo ha nkata iri na abụọ. 21 Ma ndị riri nri ahụ dị puku ụmụ nwoke ise, nʼagụnyeghị ụmụ nwanyị, na ụmụntakịrị.

Veja também