Publicidade

Mateus 17

Nnwogha Jisọs nwoghara

1 Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn nwanne ya, rigoro nʼugwu dị elu ebe naanị ha nọdụrụ. 2 Nʼebe ahụ a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha, ihu ya na-enwupụ dị ka anyanwụ, uwe ya chapụkwara dị ka ìhè. 3 Nʼotu ntabi anya ahụ, ha hụrụ Mosis na Ịlaịja ka ha na ya na-ekwurịta okwu.

4 Mgbe ahụ Pita sịrị Jisọs, "Onyenwe anyị. dị mma ka anyị niile nọdụ nʼebe a. bụrụ na ga-enye m ike, aga m ewu ụlọ ikwu atọ nʼebe a. Otu nʼime ụlọ ndị a ga-abụ nke gị, otu nke Mosis, nke ọzọ nke Ịlaịja."

5 Mgbe ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe ojii nke na-enwu enwu kpuchiri ha, olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, "Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma. Geenụ ya ntị."

6 Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ olu a, ha dara nʼala nʼihi egwu. 7 Ma Jisọs jekwuuru ha metụ ha aka sị ha, "Bilienụ, unu atụla egwu." 8 Mgbe ha lelitere anya ha, o nwekwaghị onye ọzọ ha hụrụ ma bụghị naanị Jisọs.

9 Ma mgbe ha si nʼelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs nyere ha iwu, sị, "Unu agwala onye ọbụla ihe unu hụrụ tutu ruo mgbe Nwa nke Mmadụ ga-esi nʼọnwụ bilie."

10 Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, "Gịnị mere ndị ozizi iwu ji na-ekwu na Ịlaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?"

11 zara sị, "bụ ezie, Ịlaịja na-abịa, ga-emekwa ka ihe niile dị ka dị na mbụ. 12 Ma Ịlaịja abịalarị, ma ndị mmadụ amataghị ya. Kama ndị mmadụ emeela ya ihe ọjọọ dị iche iche. Otu a kwa ka mụ onwe m bụ Nwa nke Mmadụ ga-esi ahụ ahụhụ site nʼaka ha." 13 Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya ghọtara na bụ Jọn omee baptizim ka na-ekwu banyere ya.

gwọrọ nwa akwụkwụ

14 Mgbe ha bịarutere nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, otu nwoke bịakwutere ya gbuo ikpere nʼihu ya, 15 rịọọ ya sị, "Onyenwe m, biko, meere nwa m nwoke ebere, nʼihi na akwụkwụ na-adọ ya. na-ata oke ahụhụ, ọtụtụ mgbe na-adaba nʼime ọkụ maọbụ nʼime mmiri. 16 Ma ekuteere m ya ndị na-eso ụzọ gị ka ha gwọọ ya, ma ha enweghị ike ime ka ahụ dị ya mma."

17 Jisọs zara sị, "Unu ọgbọ a na-enweghị okwukwe, ndị na-adịghị erubekwa isi. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anọ na-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtaranụ m nwata ahụ nʼebe a." 18 Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, mee ka o si nʼime nwata ahụ pụta. Otu mgbe ahụ, mmụọ ọjọọ ahụ pụtara, nwata ahụ bụ onye agwọkwara nʼotu oge ahụ.

19 Mgbe e mesịrị, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị, "Gịnị mere o ji siere anyị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ?"

20 sịrị ha, "bụ nʼihi na okwukwe unu nwere esighị ike. Nʼezie, agwa m unu, bụrụ na unu e nwee okwukwe nke dị nta ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike sị ugwu a, Site nʼebe a wezuga onwe gị,ga-apụtakwa. dịghị ihe unu na-agaghị enwe ike ime. 21 Ma mmụọ ọjọọ dị otu a agaghị apụ, ma bụghị naanị site nʼikpe ekpere na ibu ọnụ."17:21 Ụfọdụ akwụkwọ na-edebanye okwu ndị a dịka ọ dị nʼakwụkwọ Mak 9:29.

Jisọs ekwuo okwu ọnwụ ya ọzọ

22 Mgbe ha gbakọrọ na Galili, Jisọs gwara ha sị, "A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmadụ. 23 Ha ga-egbukwa ya, ma nʼụbọchị nke atọ a ga-eme ka o si nʼọnwụ bilie." Nke a wutere ha nke ukwuu.

Ịtụ ụtụ ụlọnsọ ukwu

24 Mgbe ha bịaruru na Kapanọm, ndị na-ana ụtụ nʼihi ụlọnsọ17:24 Didrakma abụọ bụ ọnụ ego ụtụ ụlọnsọ. bịakwutere Pita jụọ ya sị, "Onye ozizi unu dịghị atụ ụtụ ụlọnsọ?"

25 Pita zara ha sị, "E, na-atụ ụtụ."

Mgbe batara nʼụlọ, Jisọs buru ụzọ jụọ ya sị, "Gịnị ka i chere banyere nke a Saimọn? bụ nʼaka ndị ole ka ndị eze ụwa si anakọta ụtụ taks? bụ nʼaka ụmụ ha, ka bụ nʼaka ndị ọbịa?"

26 Ma mgbe Pita zara ya sị, "bụ site nʼaka ndị ọbịa."

Jisọs sịrị ya, "dị mma. Iwu ejighị ndị bụ ụmụ. 27 Ma otu dị, achọghị m ka anyị mee ka iwe wee ha. Gaa nʼosimiri ahụ tụnye nko azụ gị nʼime ya. Meghe ọnụ azụ mbụ ga-egbute. ga-ahụ otu mkpụrụ ego nʼime ọnụ ya. Were ya nye ha, ka bụrụ ụtụ nke mụ na gị."

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-