Publicidade

Mateus 18

Onye dịkarịrị ukwuu

1 Nʼoge ahụ kwa, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ajụjụ sị, "Olee onye dị ukwuu karịa ibe ya nʼalaeze eluigwe?"

2 kpọrọ otu nwantakịrị, onye o mere ka o guzoro nʼetiti ha, 3 sịrị, "Nʼezie, agwa m unu, bụrụ na unu agbanweghị ma dịrị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba nʼalaeze eluigwe. 4 Onye ọbụla wedara onwe ya ala dị ka nwantakịrị a bụ onye dịkarịsịrị ukwuu nʼalaeze eluigwe. 5 Onye ọbụla nabatara nwantakịrị dị otu a nʼihi m, bụ onye nabatara m.

Ihe na-eweta ịda mba

6 "Ma bụrụ na onye ọbụla nʼime unu emee ka otu nʼime ndị a dị nta, bụ ndị tụkwasịrị m obi, jehie nʼokwukwe ya, kaara onye ahụ mma na e kedoro ya nkume igwe nri nʼolu, tụnye ya nʼoke osimiri ka mmiri rie ya. 7 Ahụhụ ga-adịrị ụwa nʼihi ihe ndị na-eme ka mmadụ jehie. Ihe ndị na-eme ka mmadụ daba nʼọnwụnwa aghaghị ịbịa, ma ahụhụ ga-adịrị onye ahụ nke ga-esite nʼaka ya bịa. 8 Nʼihi nke a, bụrụ na aka gị maọbụ ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufukwaa ya. kaara gị mma inwe ọrụsị maọbụ daa ngwụrọ baa na ndụ, karịa na ga-enwe aka abụọ maọbụ ụkwụ abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ebighị ebi. 9 Ọzọ, bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa na ndụ, karịa inwe anya abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ.

Atụrụ furu efu

10 "Lezienụ anya ka unu ghara ileda otu nʼime ụmụntakịrị ndị a anya. Nʼihi na nʼeluigwe, ndị mmụọ ozi ha na-anọ nʼihu Nna m mgbe niile. 11 Nʼihi na Nwa nke mmadụ bịara ịzọpụta ndị furu efu.18:11 Ụfọdụ akwụkwọ mgbe ochie na-edebanye okwu ndị a dịka ọ dị nʼakwụkwọ Luk 19:10.

12 "Gịnị ka unu chere? bụrụ na dị onye nwere narị atụrụ, ma otu nʼime ha akpafuo, gịnị ka ga-eme? gaghị ahapụ iri atụrụ itoolu na itoolu fọdụrụ pụọ jegharịa nʼugwu na ndịda niile, ịchọ atụrụ ahụ kpafuru akpafu? 13 bụrụkwa na chọta ya, gịnị ka ga-eme? Nʼezie, agwa m unu, ga-aṅụrị oke ọnụ nʼihi otu atụrụ a karịa iri atụrụ itoolu na itoolu ndị ọzọ ahụ na-agahieghị ụzọ. 14 Ya mere, bụghị nzube Nna m nke bi nʼeluigwe ka otu nʼime ụmụnta ndị a ala nʼiyi.

Mmehie nke nwanne

15 "bụrụ na nwanna gị emehie megide gị, jekwuru ya ebe naanị gị na ya nọ, tụọ ya mmehie nʼanya. bụrụ na o gee gị ntị, i ritela nwanna gị nʼuru. 16 Ma bụrụ na o geghị gị ntị, kpọrọ otu onye maọbụ mmadụ abụọ ọzọ laghachi azụ nʼebe nọ, ka okwu ọbụla ekwuru bụrụ nke mmadụ abụọ maọbụ atọ ga-agba akaebe banyere ya.18:16 Dit 19:15. 17 bụrụ na o geghị ha ntị, gwa ndị chọọchị, ma bụrụ na o geghịkwa bụladị ndị chọọchị ntị, were ya dị ka onye mba ọzọ maọbụ onye ọna ụtụ.

18 "Nʼezie, asị m unu, na ihe ọbụla unu kere agbụ nʼụwa a, e keela ya rịị agbụ nʼeluigwe. Ihe ọbụla kwa unu tọpụrụ nʼụwa, a tọpụkwala ya rịị nʼeluigwe.

19 "Ọzọ, ana m agwa unu nʼezie a sị, bụrụ na mmadụ abụọ nʼetiti unu ekwekọrịta nʼụwa banyere ihe ọbụla unu na-arịọ nʼekpere Nna m bi nʼeluigwe ga-emezuru unu ihe ahụ. 20 Nʼihi na ebe ọbụla mmadụ abụọ maọbụ atọ zukọtara nʼaha m, mụ onwe m nọ nʼetiti ha."

Mkpa dị inwe obi mgbaghara

21 Mgbe ahụ Pita bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ sị, "Onyenwe anyị, bụ ugboro ole ka m ga-agbaghara nwanne m nke mehiere megide m? bụ ugboro asaa?"

22 Jisọs zara sị ya, "bụghị ugboro asaa. Kama ga-agbaghara ya ruo iri ugboro asaa ụzọ asaa.18:22 Ọnụọgụgụ nke a bụ narị anọ na iri itoolu.

23 "A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere eze ahụ kpebiri ka ya na ndị ọrụ ya gụzie ego ya ha ji. 24 Mgbe ha malitere na-apịazi, a kpọtaara eze ahụ otu onye nke ji ya ụgwọ ruru puku talenti iri.18:24 Ihe ruru nde naịra abụọ maọbụ karịa. 25 Nwoke ahụ enweghị ihe ga-eji kwụọ ụgwọ o ji. Nna ya ukwu nyere iwu ka e refuo ya na nwunye ya na ụmụ ya, na ihe niile o nwere, ka akwụghachi ụgwọ o ji.

26 "Ma ohu ahụ dara nʼala, gbukwaa ikpere ya nʼala, rịọ ya arịrịọ sị, Onyenwe m, biko, nwee ntachiobi nʼebe m nọ. Aga m akwụghachikwa gị ụgwọ niile m ji gị. 27 Nna ukwu onye ọrụ ahụ nwere ọmịiko nʼebe nọ, meere ya ebere. sịrị ya akwụghachila ụgwọ o ji ọzọ.

28 "Ma mgbe ohu ahụ sitere nʼebe ahụ pụọ, hụrụ otu ohu ibe ya ji ya ụgwọ otu narị denarị. 18:28 Ihe ruru otu puku naịra maọbụ o jiri ihe ntakịrị karịa. O jidere ya nʼaka ike, machie ya aka nʼakpịrị, sị ya, Kwụghachi m ụgwọ i ji m ugbu a.

29 "Ya mere, ohu ibe ya ahụ dara nʼala nʼihu ya rịọọ ya ka o nye ya nwantịntị oge. rịọkwara ya sị, Enyi m, biko nwee ntachiobi, aga m akwụghachi gị ụgwọ m ji gị.

30 "Ma o kwenyeghị, kama gara tụba ya nʼụlọ mkpọrọ, ebe ga-anọ ruo mgbe kwụsịrị ụgwọ niile o ji ya. 31 Mgbe ndị ohu ibe ya hụrụ ihe mere, o wutere ha nke ukwuu. Ha jekwuru Nna ha ukwu kọọrọ ya ihe niile ndị a.

32 "Nʼihi nke a Nna ya ukwu kpọrọ ohu ahụ sị ya, Ohu obi ọjọọ! Agbaghara m gị ụgwọ ahụ niile i ji, nʼihi na rịọrọ m arịrịọ. 33 bụ na kwesighị inwe obi ebere nʼebe ohu ibe gị nọ, dị ka m si mere gị ebere? 34 Nʼihi iwe, Nna ya ukwuu nyefere ya nʼaka ndị nche na-eche ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ ka ha taa ya ahụhụ, ruo mgbe kwụchara ụgwọ niile o ji.

35 "Otu a ka Nna m bi nʼeluigwe ga-emekwa unu, ma bụrụ na unu ejighị obi unu niile gbaghara ụmụnna unu."

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_12-11-46-