Pular para o conteúdo
Publicidade

Mateus 20

Ilu banyere ndị ọrụ ubi

1 "Ihe ọzọ a ga-eji tụnyere alaeze eluigwe bụ nwoke nwere ala ubi, onye pụrụ nʼisi ụtụtụ ịkpọta ndị ọrụ ga-arụ ọrụ nʼubi vaịnị ya. 2 Ya na ndị ọrụ ahụ kwekọtara na ga-akwụ ha otu denarị, nʼihi ọrụ ụbọchị ahụ. Emesịa o zigara ha nʼubi vaịnị ya.

3 "Mgbe pụrụ nʼihe dị ka elekere itoolu nke ụtụtụ, o sitere nʼebe a na-akpọta ndị ọrụ na-agafe hụ ndị ọzọ ka ha guzoro nʼọma ahịa na-enweghị ọrụ ha na-arụ. 4 sịrị ha, Unu onwe unu gaakwanụ rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m, ihe ọbụla ziri ezi ka m ga-akwụ unu. 5 Ya mere ha gara.

"pụkwara nʼelekere iri na abụọ na elekere atọ nke ehihie, ma meekwa otu ihe ahụ. 6 Mgbe o ruru elekere ise nke anyasị, pụrụ hụ ndị ọzọ ka ha guzoro. jụrụ ha ajụjụ sị, Gịnị mere unu ji guzoro nʼebe a taa niile na-arụghị ọrụ?

7 "Ha zara sị ya, Nʼihi na dịghị onye kpọrọ anyị ọrụ.

"gwara ha sị, Unu onwe unu gaakwanụ rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m. Aga m akwụkwa unu ihe dị mma.

8 "Mgbe o ruru oge anyasị, onye nwe ubi vaịnị ahụ gwara onye na-elekọtara ya ndị ahụ anya sị, Kpọkọta ndị ọrụ ahụ kwụọ ha ụgwọ, site na ndị ikpeazụ bịara ọrụ ruo na ndị bu ụzọ.

9 "Mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nʼelekere ise anyasị naara ego ha, a kwụrụ ha otu denarị, otu denarị. 10 Ma mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nʼisi ụtụtụ bịara ịnara ego ha, ha lere anya na a ga-akwụ ha karịa. Ma a kwụkwara ha niile otu denarị. 11 Mgbe ha naara ego ahụ, ha tamuru ntamu megide nna nwe ụlọ, 12 na-asị, Ndị a bịara nʼikpeazụ rụrụ ọrụ naanị otu awa, ma i meela ka anyị na ha hara. Anyị bụ ndị buru ihe mgbu nke ọrụ ma okpomọkụ nke anwụ niile chara nʼụbọchị taa.

13 "Ma zara otu nʼime ha sị, Enyi m, emeghị m gị ihe ọjọọ ọbụla. bụ na mụ na gị ekwughị na m ga-akwụ gị otu denarị nʼụbọchị? 14 Nara nke ruru gị laa. A chọrọ m ịkwụ ndị a bịara nʼikpeazụ ụgwọ dị ka m si kwụọ gị. 15 bụ na m enweghị ike iji ihe m nwere mee otu masịrị m? bụ anya ukwu ka na-enwe nʼihi afọ ofufu m?

16 "Ya mere, onye ikpeazụ ga-abụ onye bu ụzọ, ma onye bu ụzọ ga-abụkwa onye ikpeazụ."

Veja também