Pular para o conteúdo
Publicidade

Mateus 20

Ndị ìsì abụọ Jisọs gwọrọ

29 Mgbe ha na-ahapụ Jeriko, ọtụtụ igwe mmadụ sooro ya nʼazụ. 30 Ndị ìsì abụọ nọ nʼakụkụ ụzọ ahụ. Mgbe ha nụrụ na bụ Jisọs na-abịa, ha malitere iti mkpu nʼoke olu na-asị, "Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!"

31 Igwe mmadụ ahụ baara ha mba ka ha mechie ọnụ ha. Ma ndịisi ahụ nọgidesịrị ike na-eti mkpu nʼoke olu na-asị, "Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!"

32 Mgbe Jisọs bịaruru nʼebe ha nọ, o guzoro kpọọ ha, jụọ ha sị, "Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?"

33 Ha zara sị ya, "Onyenwe anyị, biko, anyị chọrọ ka i mee ka anyị hụ ụzọ."

34 Jisọs nwere ọmịiko nʼahụ ha. O metụrụ ha aka nʼanya. Ngwangwa ha bidoro ịhụ ụzọ, ma sorokwa ya.

Veja também