15 Ma mgbe ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu hụrụ ihe ịrịbama ndị a, hụkwa ka ụmụnta na-eti mkpu nʼoke olu nʼogige ụlọnsọ ahụ, na-asị, "Hozanna dịrị Nwa Devid." Iwe were ha nke ukwuu.
16 Ha sịrị ya, "Ị na-anụkwa ihe ụmụnta ndị a na-ekwu?"
Jisọs zara sị ha, "E, ana m anụ ya. Ọ bụ na unu agụtabeghị ihe akwụkwọ nsọ kwuru sị,
" ‘I sitere nʼọnụ ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara
gị, Onyenwe anyị, kwadooro otuto gị’ 21:16 Abụ 8:2 ?"