Pular para o conteúdo
Publicidade

Matiu 22

Ọlụlụ nwunye na mbilite nʼọnwụ

23 Nʼụbọchị ahụ kwa, ụfọdụ ndị Sadusii, ndị na-asị na mbilite nʼọnwụ adịghị, bịakwutere ya ịghụ ya ọnụ. 24 Onye ozizi, "Mosis kwuru sị, bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwa, nwanne ya nwoke ga-alụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ka mụtara nwanne ya nwoke ahụ nwụrụ anwụ nwa. 25 Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa nʼetiti anyị. Onye nke mbụ lụrụ nwunye, nwụọ, ma ebe dịghị ụmụ mụtara, hapụrụ nwanne ya nwunye ya. 26 Otu a ka nke abụọ mekwara, ma nke atọ, ruo na nke asaa. 27 Nʼikpeazụ, nwanyị ahụ nʼonwe ya nwụkwara. 28 Ugbu a, nʼoge mbilite nʼọnwụ, nwunye onye ka nwanyị a ga-abụ, ebe bụ na ụmụnne nwoke asaa ndị a lụtụchara ya mgbe nọ nʼụwa?"

29 Jisọs zara ha sị, "Unu na-ejehie ụzọ nʼihi na unu aghọtaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu. Unu aghọtakwaghị ụdị ike Chineke nwere. 30 Nʼihi na mbilite nʼọnwụ, ịlụ di na nwunye agaghị adịkwa, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nʼeluigwe. 31 Ma nʼihe banyere mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, bụ na unu agụtabeghị ihe Chineke gwara unu sị, 32 Mụ onwe m bụ Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.22:32 Ọpụ 3:6 bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama bụ nke ndị dị ndụ."

33 Mgbe igwe mmadụ ahụ nụrụ nke a, ozizi ya juru ha anya.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também