Pular para o conteúdo
Publicidade

Mateus 25

Ụmụ agbọghọ iri

1 "A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere akụkọ ụmụ agbọghọ iri ndị weere oriọna ha pụta izute onye na-alụ nwunye ọhụrụ. 2 Ise nʼime ha maara ihe, ma ise ndị ọzọ bụ ndị nzuzu. 3 Ise ndị nzuzu ahụ weere oriọna ha, ma ha ejighị mmanụ ọkụ. 4 Ise ndị maara ihe, wụjuru mmanụ ọkụ na karama, tinyekwa oriọna ha. 5 Mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ ahụ nọrọ ọdụ nʼọbịbịa ya, ụra tụwara ha, ha dinara ala rahụ ụra.

6 "Nʼetiti abalị e tiri mkpu nʼoke olu sị, Onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-abịa, pụtanụ gaa zute ya!

7 "Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ niile ahụ 25:7 E mere ka anyị mara na ndị a bụ ndị ha na nwoke ọbụla e dinabeghị. biliri mụnye oriọna ha. 8 Ise ndị nzuzu ahụ rịọrọ ise ndị maara ihe sị, Biko, wụnyetụrụnụ anyị ụfọdụ nʼime mmanụ ọkụ unu, lee na oriọna anyị na-anyụ anyụ.

9 "Ndị maara ihe zara ha sị, Mba! gaghị ezuru anyị na unu. Kama gaanụ zuru nke unu nʼaka ndị na-ere ya.

10 "Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịarutere. Ndị jikeere ejikere soro ya banye nʼoriri ọlụlụ di na nwunye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ.

11 "Emesịa, ise ndị nzuzu ahụ 25:11 Ụmụ agbọghọ ise ndị nzuzu lọghachiri na-ekwu sị, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, meghere anyị ụzọ!

12 "Ma zaghachiri ha sị, Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, amaghị m ndị unu bụ.

13 "Ya mere, na-anọgidenụ na nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ.

Veja também