Nkwusa nke Jọn
1 Nʼoge ahụ, Jọn omee baptizim bịara na-ezisa ozi nʼọzara Judịa. Isi okwu ya bụ, 2 "Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso." 3 Nʼihi na nwoke a bụ onye e kwuru okwu banyere ya site nʼọnụ onye amụma Aịzaya sị,
"Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị,
‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị,
meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’ "3:3 Aịz 40:3
4 Jọn yi uwe e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike ukwu nke akpụkpọ anụ nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ. 5 Nʼoge ahụ, ndị mmadụ sitere Jerusalem, na Judịa niile, nʼala niile dị Jọdan gburugburu, na-apụkwuru ya. 6 Mgbe ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan.