9 "Sinụ otu a na-ekpe ekpere:
" ‘Nna anyị nke bi nʼeluigwe,
ka e doo aha gị nsọ.
10 Ka alaeze gị bịa,
ka e mee uche gị nʼụwa,
dịka e si eme ya nʼeluigwe.
11 Nye anyị nri nke ụbọchị taa.
12 Gbaghara anyị mmehie anyị,
dịka anyị si agbaghara ndị na-emehie megide anyị.
13 Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa,
kama, zọpụta anyị nʼaka ajọ onye ahụ.’ 6:13 Akwụkwọ ochie ụfọdụ na-emechi ekpere a nʼụzọ dị otu a, nʼihi nʼalaeze bụ nke gị, ike na otuto ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.