Publicidade

Mateus 6

9 "Sinụ otu a na-ekpe ekpere:

" Nna anyị nke bi nʼeluigwe,

ka e doo aha gị nsọ.

10 Ka alaeze gị bịa,

ka e mee uche gị nʼụwa,

dịka e si eme ya nʼeluigwe.

11 Nye anyị nri nke ụbọchị taa.

12 Gbaghara anyị mmehie anyị,

dịka anyị si agbaghara ndị na-emehie megide anyị.

13 Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa,

kama, zọpụta anyị nʼaka ajọ onye ahụ. 6:13 Akwụkwọ ochie ụfọdụ na-emechi ekpere a nʼụzọ dị otu a, nʼihi nʼalaeze bụ nke gị, ike na otuto ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_12-11-46-