Pular para o conteúdo
Publicidade

Matiu 7:15-20

Osisi na mkpụrụ ya

15 "Kpachapụnụ anya! Nʼihi na ndị amụma ụgha dị. Ha na-abịakwute unu nʼụdịdị atụrụ, ma ha bụ agụ. 16 A ga-esite na mkpụrụ7:16 Mkpụrụ Nʼebe a o bụ ihe Igbo na-akpọ omume maọbụ agwa. ha mata ndị ha bụ. Ndị mmadụ ọ na-esite nʼosisi ogwu dị nʼọhịa ghọta mkpụrụ osisi grepu, ka ha na-esite nʼosisi uke gbara nʼọhịa ghọta mkpụrụ fiig? 17 Nʼụzọ dị otu a, osisi ọbụla dị mma na-amịpụta mkpụrụ ọma, ma osisi dị njọ na-amịpụta mkpụrụ dị njọ. 18 Osisi na-amị mkpụrụ ọma adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Nke na-amị mkpụrụ ọjọọ adịghịkwa amị mkpụrụ ọma. 19 Ma osisi ọbụla na-amịghị mkpụrụ ọma ka a ga-egbutu tụnye ya nʼọkụ. 20 Ụzọ e si amata osisi ọma bụ site na mkpụrụ ya.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.