Ebili mmiri adajụọ
23 Mgbe ọ banyere nʼụgbọ, ndị na-eso ụzọ ya sooro ya. 24 Nʼotu ntabi anya, oke ifufe bidoro ife nʼọdọ mmiri ahụ, nke mere na ebili mmiri na-ekpuchi ụgbọ ahụ. Ma ọ nọ na-arahụ ụra mgbe ihe ndị a na-eme. 25 Ndị na-eso ụzọ ya jekwuuru ya, kpọtee ya, sị ya, "Onyenwe anyị, zọpụta anyị! Lee, na anyị nʼala nʼiyi."
26 Ma ọ zaghachiri, "Unu ndị okwukwe nta, gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu?" Mgbe ahụ o biliri baara ifufe ahụ na ebili mmiri ahụ mba. Ha niile dajụrụ, deere jii.
27 O juru ndị na-eso ụzọ ya anya, mee ka ha jụọ ajụjụ sị, "Ọ bụ ụdị mmadụ dị aṅaa ka nwoke a bụ? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-eme ihe o kwuru."