Pular para o conteúdo
Publicidade

Matiu 9

2 Ndị ikom ụfọdụ butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, bụ onye dina nʼute. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ndị ahụ, gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, "Nwee obi ike nwa m nwoke nʼihi na a gbagharala gị mmehie gị niile."

3 Nʼoge a, ụfọdụ ndị ozizi iwu nke ndị Juu nọ nʼebe ahụ sịrịtara onwe ha, "Nwoke a na-ekwulu Chineke."

4 Ma ebe Jisọs matara ihe ha na-eche nʼobi ha, sịrị, "Gịnị mere unu ji na-eche ajọ echiche nʼobi unu? 5 Olee nke ka mfe ikwu? bụ sị, A gbagharala gị mmehie gị niile,ka bụ sị, Bilie jee ije? 6 Ma ka unu mata na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie." sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, "Bilie, chịrị ute gị laa!" 7 Nwoke ahụ biliri, chịrị ute ya laa nʼụlọ ya.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também