2 Ndị ikom ụfọdụ butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, bụ onye dina nʼute. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ndị ahụ, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, "Nwee obi ike nwa m nwoke nʼihi na a gbagharala gị mmehie gị niile."
3 Nʼoge a, ụfọdụ ndị ozizi iwu nke ndị Juu nọ nʼebe ahụ sịrịtara onwe ha, "Nwoke a na-ekwulu Chineke."
4 Ma ebe Jisọs matara ihe ha na-eche nʼobi ha, ọ sịrị, "Gịnị mere unu ji na-eche ajọ echiche nʼobi unu? 5 Olee nke ka mfe ikwu? Ọ bụ ị sị, ‘A gbagharala gị mmehie gị niile,’ ka ọ bụ ị sị, ‘Bilie jee ije’? 6 Ma ka unu mata na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie." Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, "Bilie, chịrị ute gị laa!" 7 Nwoke ahụ biliri, chịrị ute ya laa nʼụlọ ya.