Pular para o conteúdo
Publicidade

Neemias 4

Ndị iro

1 Iwe were Sanbalat nke ukwuu mgbe nụrụ na anyị na-ewuzigharị mgbidi ahụ niile. O were iwe dị ọkụ, ọnụma jukwara ya obi. chịrị ndị Juu ọchị, kwaakwa ha emo. 2 Nʼihu ndị otu ya na ndịisi agha Sameria, o kwuru si, "Gịnị ka ndị Juu ole na ole a na-adịghị ike na-eme? Ha na-achọ iwugharị mgbidi obodo a? Ha ga-achụ aja? Ha ga-arụcha ọrụ niile nʼotu ụbọchị? Ha ga-esita nʼaja a kụpịasịrị akụpịa mee ka nkume ndị a dị ndụ, ka bụ site na nkume ochie ndị a akpọrọ ọkụ?"

3 Tobaya onye Amọn, onye nọ ya nʼakụkụ mgbe ahụ, kwukwara okwu sị; "Leenụ ụdị mgbidi ha na-ewu! bụrụ na nkịta ọhịa arịkwasị ya nʼelu ga-ada!"

4 Mgbe ahụ, e kpere m ekpere sị, "Chineke, biko nụrụ emo a na-akwa anyị. Ka ịkwa emo ha laghachikwa ha nʼisi; ka a dọtakwa ha nʼagha buru ha jee mba ọzọ. 5 Elefula mmehie ha anya, agbagharakwala ha, nʼihi na ha ledara gị anya, ledakwa anyị anya, bụ ndị na-ewuzi mgbidi gị."

6 Ya mere, anyị wuziri mgbidi ahụ ruo mgbe ha niile ruru ọkara nʼịdị elu ya, nʼihi na onye ọbụla wepụtara obi ya ịrụ ọrụ.

Veja também