Publicidade

Romanos 10

1 Ụmụnna m, ihe na-agụ nnọọ obi m agụụ nke ukwu na ekpere m na-ekpe nye Chineke bụ ịhụ na a zọpụtara ha. 2 Ana m agba akaebe na ihe banyere Chineke na-anụ ha ọkụ nʼobi nke ukwuu. Kama ịnụ ọkụ nʼobi ha abụghị site na mmazu Chineke. 3 Ebe ha na-amaghị ezi omume nke si na Chineke bịa kama ha chọrọ ihiwe nke onwe ha, ha ewedaghị onwe ha nʼokpuru ezi omume nke Chineke. 4 Kraịst bụ ọgwụgwụ iwu. Ya mere, ezi omume ga-adịrị onye ọbụla nke kwere.

Ama Mosis gbara banyere idebe iwu

5 Mosis si otu a dee banyere ezi omume nke sitere nʼiwu, "Onye ọbụla na-eme ihe ndị a ga-adị ndụ site na ha."10:5 Lev 18:5 6 Ma ezi omume ahụ nke sitere nʼokwukwe na-asị, "Asịla nʼime obi gị, onye ga-arịgo nʼime eluigwe?’ "10:6 Dit 30:12 (nke bụ, ikudata Kraịst) 7 "maọbụ, Onye ga-arịda nʼime ili?’ "10:7 Dit 30:13 (nke a bụ, ịkpọlite Kraịst site na ndị nwụrụ anwụ). 8 Ma gịnị ka na-ekwu? "Okwu ahụ nọ gị nso, dị nʼọnụ gị dịrịkwa nʼobi gị,"10:8 Dit 30:14 bụ ya, bụ okwu okwukwe ahụ anyị na-ekwusa. 9 Ma bụrụ na ga-eji ọnụ gị kwupụta, na "Jisọs bụ Onyenwe anyị," kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị. 10 Nʼihi na bụ obi gị ka ga-eji kwere; a gụọ gị nʼonye ezi omume, bụkwa ọnụ gị ka ga-eji kwupụta, a zọpụta gị. 11 Dịka akwụkwọ nsọ kwuru, "Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya."10:11 Aịz 28:16 12 Nʼihi na o nweghị ihe dị iche nʼetiti onye Juu na onye mba ọzọ, otu Onyenwe anyị ahụ bụ Onye nwe mmadụ niile, na-agọzibigakwa ndị na-akpọku ya oke. 13 Nʼihi na, "Onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta."10:13 Jul 2:32

14 Ma olee otu ha ga-esi kpọkuo aha ya ma bụrụ na ha ekwereghị na ya? Olee otu ha ga-esikwa kwere nʼonye ahụ ha anụbeghị ihe gbasara ya? Olee otu ha ga-esi nụkwa ma bụrụ na ndị nkwusa adịghị? 15 Oleekwanụ otu ha ga-esi pụọ gaa kwusaa, ma bụrụ na o nweghị ndị zipụrụ ha? Dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, sị, "Lee, ka ha si maa mma bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma."10:15 Aịz 52:7

16 Ma bụghị mmadụ niile nabatara oziọma ahụ. Nʼihi na Aịzaya kwuru, "Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị?"10:16 Aịz 53:1 17 Ma bụ ihe doro anya na bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst. 18 Ma ana m ajụ, ga-abụ na ha anụghị? Ha nụrụ ya nʼezie.

"Nʼụwa niile ka olu ha pụrụ gazuo,

okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ."10:18 Abụ 19:4

19 Ọzọkwa, ana m ajụ, bụ na Izrel aghọtaghị? Na mbụ, Mosis sịrị,

"Aga m esite na ndị na-abụghị mba kpalie mmụọ ekworo nʼime unu;

aga m esitekwa nʼobodo na-enweghị nghọta kpasuo unu iwe."10:19 Dit 32:21

20 Ma Aịzaya jiri nkwuwa okwu sị,

"Ndị chọtara m bụ ndị na-adịghị ajụ ase m,

ekpugheere m onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m."10:20 Aịz 65:1

21 O kwuru banyere ndị Izrel,

"Agbasara m aka m ogologo ụbọchị niile

nye ndị nnupu isi na ndị na-ekwesị olu ike."10:21 Aịz 65:2

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-