17 Ejikwala ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere gị. Kama, na-echenụ otu unu ga-esi mee ihe dị mma nʼanya mmadụ niile. 18 Dịka ike gị niile ha, mee ka gị na onye ọbụla biri nʼudo. 19 Ndị enyi m, unu abọla ọbọ, kama hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọtara unu ọbọ. Nʼihi na e dere ya, "Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,"12:19 Dit 32:35 ka Onyenwe anyị kwuru. 20 Ma otu ọ dị,
"ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, were nri zụọ ya,
ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ihe ọṅụṅụ ka ọ ṅụọ,
mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya."12:20 Ilu 25:21,22
21 Unu ekwela ka ihe ọjọọ merie unu, kama werenụ ezi ihe merie ihe ọjọọ.